NDỊNAYA.
NDỊNAYA……………………………………………….i
Mmalite…………………………………………………….1
1.1. Ka obodo m bụ Agbamere si bido.
1.2. Nlọta Agbamere.
1.3. Ndi Agbamere Na Ihe Ha N’ Eme.
ISI NKE
ABỤỌ………………………………………………………2
2.1. Ọtụtụ ihe eji
mara Agbamere.
2.2. Emume ọzọ ndị
Agbamere n’ eme bụ: ITI AKATAKPA.
2.3. Ọzọ bụ, emume
maa.
2.4. Ekala
ISI NKE
ATỌ………………………………………………..8
3.1. Oriri Ezemkpume
3.2. Oriri Ugwube
3.3. Ịgọ Okike
ISI NKE
ANỌ………………………………………………………..10
4.1. Ihe ọzọ eji mara
Agbamere
4.2. MMECHI.
EBE ỌRỤA SI…………………………………………….11
Malite Okwu.
N’ ime ihe odidea enwere ọtụtụ ihe dị gasi n’ ime ya. Nke mbụ
bụ, KA OBODO M BỤ AGBAMERE siri bido. Nkea n’ akọwa etu Alụmọna bụ onye Ịgala
si lọta n’ Eha-Alumona mụbawa wee mụta ụmụ ya atọ, bụ Eha, Agbamere na Ụmabọ,
ndị mụtara ndị bụ zị ndị Eha-Alụmọna kịta. Otu n’ ime ụmụ atọ ndịa bụ Agbamere
were laa, mụbawa nke ya wee mụta ụmụ atọ bụ Ọlụ, Owere-Ala na Okwe, ndị nke
mụtara ndị Agbamere nile. Ha bụ ndị ewere dịka ndị nna Agbamere nile.
Agaba kwa n’ ihu ị ga ahụ kwa ọtụtụ ihe ndi Agbamere eme. Dịka
etu ha siri gọọ mụọ ọfụma tupu ụka abịa. Ọtụtụ ihe eji mara
Agbamere bụ ụdị mmeme mụọ ha n’ emechaa. Ya na ihe ọma na ihe ọjọọ ndị ọzọ eji
mara ha. Etu ha si eti mụọnwụ na ọtụtụ ọrụ ndị ọzọ ha n’ arụgasị, na kwa ekwe
ekwe ha. Continue Reading
IKE MBỤ
1.1. Ka obodo m bụ Agbamere si bido.
Alụmọna bụ otu nwa nwoke Atta ḷgala onye nke bụ EZE IGALA dị n’
Kogi Steeti nke Nigeria. Ọ bụ kwa odogwu n’ agha ndị ḷgala, ọ bụ maka udi onye
ọ bụ mere n’ nna ya bụ Atta ḷgala ji zipu ya ka ọ gaba njem. Ka Alụmọna biara,
obiri n’ ebe anakpọ Eha-Alụmọna kịta. Ọ mụtara ụmụ atọ ndị ọkpọrọ, Eha,
Agbamere na Ụmabọ. Aha oji akpọkọta ha nile bụ Nkpụnatọ. Nkea mere n’ onye
ọbụla si Eha-Alụmọna jee ḷgala, Atta n’ enye ya oche dịka nwa ya, ruo taa.
N’ ime ụmụ atọ ndị ahụ, Agbamere bụ nwa nke abụọ n’ ime
ha. Ha nile bi dịka otu ezinụlọ, ruo oge ha bidoro mụwa ọtụtụ ụmụ nke mere n’
ọnụọgụgụ ha ji karia nke n’ obodo ndị nọ ha nso biara nwebe anya ụfụ ebe ha
nọọ. Ha bidoro lụsobe ha agha, obodo ndị dịka Ọba, Nsụkka Ede-Obala na Opi. Ndị
Nsụkka biara gbukerie ndi Eha-Alụmọna nke mere ha jiri napụ ha ṅnukwu ala ha
nke dị n’ oke ala ha n’ ndị Nsụkka. Eha-Alụmọna biara kpọkuo ụmụ y anile ọnụ
gwa ha ka ha dị njikere n’ ha ga aga ị buso ndị Nsụkka agha ma nagha chite ha
ala ha ahụ anara ha. Ha gara agha ahụ ma merie, n’ ime agha ahụ ka ha nọrọ mara
n’ Agbamere kacha dị ike ma yie kwe nna ha. Nna ha gwara Agbamere n’ ebe ọbụ n’
ya kacha dị ike n’ ime ụmụ ya atọ ndịa, ka ọ ga biri n’ oke ala ya na ndi
Nsụkka, ọgwakwara ndị nke ọzọ n’ ha nuọ ude nwanne ha ka ha gaa nyere ya aka ma
ya bụrụ n’ onwechitere ma biri n’ ala ahụ anara ya n’ izizi.
1.2. Nlọta Agbamere.
Agbamere lọtara ebe ọdị ruo taa, oge ebe ahụ ka abụ nnukwu ọhịa.
Obidoro sụchawa ebe ahụ ka ọdị ka ebe mmadụ n’ ebi. Aha ebe ahụ ọzọrọ ụkwụ, ebe
izizi obiri bụ Ụmụelechi Ogiri, ya mere ruo taa Ụmụelechi bụ ya bụ NNA
Agbamere. Ọkwadoro onwe ya maka ọgụ nwere ike ịdapụta. Agbamere mụtara ụmụ atọ
dịka nna ya Alụmọna, ọkpọrọ ụmụ ya ndịa Ọlụ, Owere-Ala na Okwe. Ọlụ biri n’
Ụmụelechi maka n’ ọ bụ nwa izizi wee mụta ụmụ asaa ndị bụ Ụmụelechi, Ogbodu,
Amachara, Amike, Ụmụoshogwu, Ụmụọkwọ na Uwelu. Owere-Ala biri n’ ebe ana akpọ
Ọhamaka ọ mụtakwara ụmụ iri ndị bụ Ọhamaka, Ụmụigboke, Ụmụishule, Amadị-Egbara,
Amọja-Owere Ugwu, Okpuhu-Owere Ugwu, Ụmụọkwọ Owere-Ala na Amọrị Owere Ugwu.
Okwe bụ nwa ikpeazụ biri n’ Eziokwe Uwelu were mụta ụmụ asaa, Eziokwe Uwelu,
Ụmụokwenye, Ọgwashị, Ụmụebiem, Ụmụewụka, Eziokwe Ụwala na Ibegama.
Oge Nsụkka matara n’ Agbamere amụtala ọtụtụ ụmụ ndị n’ ebichizi
ala ahụ nile ha n’ azọ, ha malitere agha ọzọ nke tara ọtụtụ isi ndị mmadụ. Oge
a n’ alụ aghaa, Agbamere kpọrọ ụmụ y anile ka ha bia lụọ ya bụ ọgụ, n’ ebe
ọbụla ịlụtara ga abụ nke onye ahụ. Ụmụ Agamere nile biara tinye aka n’ ọgụ ahụ
ma merie na ya bụ agha. Ụmụ Agbamere nile tinyere aka n’ ọgụ ahụ, nke
mere na ruo taa, n’ ebe a n’ akpọ Ọdọbido n’ Agbamere, mpaghara Agbamere nile
bi n’ ebe ahụ. Agha mere eji n’ akpọzị Agbamere, AGBA OMORU nke bụ ihe a na
akpọ ndị agha n’ ala Igala, ya bụ na ha gbaa na ha na agbatanata ihe ha chọrọ
igba.
1.3. Ndi Agbamere Na Ihe Ha N’ Eme.
Ndị Agbamere kwere n’ udo, ịdị n’ otu na ịhụrịta onwe ha n’
anya, ha kwenyere n’ ọ bụrụ na ha ekewe n’ aga egbu ha, maka n’ anụ n’ agba ofu
ofu n’ ala ofu ofu. Ihe mere otu n’ ime ha, mere ha nile. Ha dị ike ma n’ arụpụta
ọrụ nke ukwuu. Tupu ụka abia, ha n’ agọ mụọ, nke mere n’ enwere ọtụ mụọ ana agọ
agọ n’ Agbamere, ndị dịka, Ezemkpume nkwọshimiri, Ugwube oshimiri, Eme, Ọnụ
Okike na mụọ ndị aka nwe cha, nke bụ nke ndị mmadụ n’ abụrọ nke obodo nile.
Mụọa nile nwere ndị n’ agọ ha ana akpọ ATTAMA, ha nile nwere kwara ebe ha dị
ana akpọ ọnụ mụọ. Oriri nile ana eri gbasara CHI bụ ọnụ mụọ ka ana eri ha nile.
Oriri ndị ahụ gụnyere, Ekala, Oriri Ezemkpume, Oriri Ugwube, Iri ji ọhụrụ, Ụda
Maa, Ụla Maa na Igọchi deregawazie.
ISI NKE ABỤỌ
2.1. Ọtụtụ ihe eji
mara Agbamere.
Ndị Agbmere n’ eme mmeme dị iche iche nke gụnyere ndịa: IRI
JI ỌHỤRỤ
Iriri ji ọhụrụ bụ
oriri inye ekele n’ ala Agbamere. Ọkacha nwe ugwu n’ mmeme nile a n’ eme n’
Agbamere. A n’ akpọkwa oriria, Emume iwa ji ọkụ na Iwa ji. Ụbọchịa n’ eri
ji ọhụrụ, onye ọbụla rugoro ogo ịkọta ji n’ asụ ụtara ji, buru mmanya na oke
ọkpa gaa n’ mụọ nke ụmụnna ya. Emecha Onye isi (ya bụ onye tọchara) ekele onye
ọbụ n’ okwu ndia:
Unu abọọ!
Anyị abọọ na ọ bụ ka
ịbọrụ!
Ụmụnna Kwe nu!
Yaa!
Kwe nu!
Yaa!
Kwe zụọ nu!
Yaaoooooooo!
Nke Onye dịrị ya
Onye iro anyị biri, ma
anyị biri
Ya bara Onye, bara
Onye
Onye anwụla, m’ibe ya
efula
Ogburu Onye n’onye
ga-ala
Njọ na njọ zu kwara
Mma na Mma zu kwara
K‚anyi rie Ji Ọhụrụ
afọ nkea n’ Udo
Egbe bere, Ugo bere,
Nke si ibe ya ebela
nku kwa kwaa ya
Iseeeeeeeeeee!
Okelecha ọgọ ma kele
mụọ maka ndụ na ji onyere ya na ndị ezinaụlọ ya. Emecha ogbuo oke ọkpa
ndị ahụ bunye ndị nwụnye ha ka ha hụọ ma sie, ha mecha ha ebughachite ha, ebido
kewe ya etu esi eke ya bụ anụ. Ekecha ha ebido riwe ma ṅua waa ihe. Eritu ma
ṅụtu ihe, abia tee nzu bido gụwa ma gbawa egwu. Egwu ha n’ agụ bụ nkea:
Anyị n’ awa gi nno,
Anọ pụtara ụbọchị anọ,
Nkwọ, Eke, Orie na Afọ.
Anyị ahụla ka ị n’
acha zaa.
Ndị nwe ji, gbara ọsọ bia,
Gọzie ji a, mee ka otu
ji mụta anọ,
N’ ọba onye ọbụla
n’ime anyị.
Ndị nna anyị lee nu ji
Ọhụrụ, soro kwe nu rie.
Iseeeeeeeeeeeeeeee!
Emecha Onye isi agụọ egwu ana akpọ (egara) nke ọ n’ anọ nime ya kpere onye
ọbụla ekpere ihe ọma.
Ka ji ọhụrụ nke afọa
bụrụ ndụ nye anyị!
Iseee!
Ka ndị nna nna anyị ha
chekwebe anyị!
Iseee!
Ka ha dube anyị!
Iseee!
Ka Chineke nye anyị
ndụ!
Iseee!
Okpecha ekpere ndịa, ebido riwekwa ihe, onye rijuo ọlawa. Nkea wee weta n’ isi
njedebe iri ji ọhụrụ nke afọ ahụ. Ụmụ okorobia ebido zie egwu nke ha. Egwua bụ
ihe ọbụla ka ha mma ka ha n’ agụ, enwero usoro eji ya bụ egwu.
2.2. Emume ọzọ ndị
Agbamere n’ eme bụ: ITI AKATAKPA.
Akatakpa bụ otu nime ọtụtụ mmanwụ a n’ eti n’ Agbamere. Akatakpa
bụ mmanwụ a n’ eti oge arụchara ọrụ ugbo. Ọ bụ ihe eji ezu ike ọrụ ugbo arụrụ.
Ọ bụ ihe egwure egwu, ọ bụ mmanwụ ụmụikorobia n’ eti. Enweghi usoro eji eti ya,
kama ọ bụ ihe onye kwadotere ya eghie. Akatakpa bụ akwa ka eji arụ ya, akwa
ọbụla dị mma iji rụọ ya bụ mmanwụ. Enwere Akatakpa dị iche iche dịka, Ori
Ngwere, Oti Mkpu, Obu Ngwu, Orie Egu, Uheleke, Edeọga Ogiri Ụgbụụ na Akatakpa
Ekpọtọ. O ruwe oge ọga ala, o bido n’ eje bee ndị okenye ka ha n’ enye ya ihe,
ma n’ asikwa ya ka owere ya ma n’ agọzi ha meek a ihe ha kọrọ n’ ubi mere ha
ọfụma. Ha nenye ya onyinye dị iche iche dika ego, akidi, ọka na anyụ
deregawazie. Ụbọchị ha n’ ala ha n’ aga ebe a n’ akpọ OTOBO ỌGWASHỊ, ebe ahụ ka
ha n’ ete egwu ikpeazụ ha. Onye isi (onye tọchara) ndị Ọgwashị n’ enye ha
onyinye dị iche iche. Akatakpa gbakarichara egwu ka aga enye oke ọkpa nke kacha
buo ibu, Akatakpa nke n’ esote ya ewere oke ọkpa nke n’ esote ya, etua ka ọdị
mana Akatakpa nke atọ. Nke kacha maa mma ka aga enyekwa oke ọkpa na isi anyụ
abụọ, nke n’ esote ya bụ oke ọkpa na otu anyụ, nke atọ bụzị sọsọ oke ọkpa. N’
abalị ụbọchi ahụ, ụmụikorobia n’ aṅụ oke mmanya ma n’ akụkwa egwu, ha ga
akụgide egwu chi efo. Akatakpa laachaa ụmụnwanyị n’ enwe be aṅụrị nihi n’ oge
ọka anọ na ha adịghị aja ije etusọrọ ha, maka n’ Akatakpa n’ emesiwe ụmụnwanyị
ike.
2.3. Ọzọ bụ, emume maa
(mụọ).
Abia n’ emume maa enwere ụda maa na ụla maa. Ọtụtụ emume ndị ọzọ
juru n’ emume maa dịka, maa igbabata ụlọ, ịtọ maa ajị, maa mgbaọtọ na ọnụ
ọkachi. Ụda maa n’ abụ n’ izu ụka nke mbụ n’ ọnwa mbụ n’ afọ abụọ abụọ, ọ n’
abụ ụbọchị ahịa Eke. Etu esi eme ya bụ n’ oru n’ isi ụtụtụ maa nke a n’ akpọ
maa ụtụtụ ga agafe n’ ekwe egwu dị iche iche, mmadụ nile n’ apụta n’ ekiri ha,
ndị nwere ihe onyinye n’ enyekwa ha. Ha n’ aga ụzọ atọ, ndị mbụ n’ abụ ndị Okwe
bụ ya bụ nwa ikpeaazụ Agbamere mụtara, ndị Owere-Ala bụ osote ya na ndị ikpeazụ
bụzị ndị Ọlụ nke bụ di ọkpara Agbamere, ka ha n’ aga ha n’ ekwe egwu ndịa.
Iyeeeeeooo!
Iyeeeeeooo!
Obodo gbaa!
Obodo gba n’ maa!
Ndiomu gbaa!
Ndiomu gba n’ maa!
Obodo gbaa!
Obodo gba n’ maa!
Iyeeeeeooo!
Iyeeeeeooo!
Nkea gachaa, ndị
mmadụ ala gaa kwadowe maka maa mgbede. Mgbede ruo, Agbamere nile n’ abia zukota
n’ ebe a n’ akpọ ỌNỤ ỌMABE ỌLỤ ebe ahụ ka maa nile ga ada n’ afọ ahụ ga abia ka
ekirie ya. Ọmabe ndịa gụnyere, Echaricha, Edi ogbene, Ọmabe Ọji, Ọmabe Ọcha na
Okokoro. Echaricha n’ a bụ maa mara mma, a n’ awuju abụba Ugo n’ isi ya, ọ bụrụ
n’ ọgbadata ṅdị okenye n’ agụrụ ya,
kpo ngege, kpo ngege!
kpa kpa nkpo!
ịyaaaaaaaaaaaaaaaaaa!
Oge ha ga asị ịyaaaaaaaaaaaaaaaaa,
Echaricha ga awuli elu, agbara ya egbe, ndị nile nọ n’ ebe ahụ ga ebido kụwara
ya aka. Ha ga eme nkea ọtụtụ oge tupu ha ala n’ nke onye isi ha. Edi ogbene bụ
ya bụ maa jọkarisiri njọ, akwa ya n’ adị atịtị, ọdịghị eme amasị nihi n’ asị n’
ọ n’ esu isi. Ọbụrụ n’ ọgafere, Ọmabe Oji ga abia gwa ndị mmadụ etu maa siri
daa n’ afọ ahụ. Ọ bụrụ na nke ndị Okwe kọcha ka siri daa, nke ndị Owere-Ala
emekwa otu ihe ahụ, nke ndị Ọlụ ga abia kọzịa maka nke ha. Ọbụrụ n’ emecha
nkea, Ọmabe Ọcha ga abia gbaa egwu eji mara ndị nke ha, ndị Okwe, Owere-Ala na
Ọlụ. Nke ikpeazụ bụzị Okokoro, ọ bụ maa toro nnukwu ogo, ọ bụ ya n’ emechi ụda
maa n’ afọ maa n’ ada. Ọbụrụ n’ Okokoro erute n’ ỌNỤ ỌMABE ỌLỤ ọga edebe nzu
ebe ahụ nke n’ egosi n’ maa dara ọfụma n’ afọ ahụ, odose nzu ahụ ndị mmadụ
ebido ịla nihi n’ maa adachala n’ afọ ahụ.
Ụla maa n’ abụ oke mmeme n’ Agbamere. Ndị Agbamere kwenyere n’
maa abụghị ihe ụmụaka ma ọ bụ ihe ụmụikorobia. Maa n’ eji ụbọchị abụọ ala,
ụbọchị ahia Nkwọ na ụbọchị ahia Eke. Ụbọchị ahia Nkwọ ka a n’ asị n’ maa n’ abọ
ụzọ. Ụbọchị ahụ ezinụlọ ọbụla n’ esi ọkpa. Ndị Okwe gaa bọcha ụzọ lawa, ndị
Owere-Ala aga mee nke ha na kwa zị ndị Ọlụ, ha n’ agụkwa otu egwu ahụ ha n’ agụ
ụbọchị ọ nada.
Iyeeeeeooo!
Iyeeeeeooo!
Obodo gbaa!
Obodo gba n’ maa!
Ndiomu gbaa!
Ndiomu gba n’ maa!
Obodo gbaa!
Obodo gba n’ maa!
Iyeeeeeooo!
Iyeeeeeooo!
Sọsọ iji ọkpa gọọ maa
ka a n’ eme ụbọchị ahụ. Eruzie ụbọchị Eke, ya bụ ụbọchị maa n’ ala, ndị nwere
ego n’ egbu Ezi ma ọtụtụ n’ egbu ewu ndị nke ọzọ n’ egbukwa ọkụkọ, ezinụlọ
ọbụla n’ ụbọchị ahụ ga asụ ụtara ji, nna na ụmụ ya ndị nwaoke torugoru esoro gawa
n’ obu ụmụnna ha. N’ isi ụtụtụ ụbọchị ahụ maa n’ aga kwa dịka osiri gaa n’
ụbọchị Nkwọ maa, mana ọbụghị ịga bọọ ụzọ kama ịga mee ihe a n’ akpọ usoro egba
afọ. Ka ọ n’ aga ọ n’ ekwe egwu ndịa:
Kwenu ụdọ awụlaga anyị
n’ anya!
Ụdọ awụlaga anyị n’
anya!
Kwenu ụdọ awụlaga anyị
n’ anya!
Ụdọ awụlaga anyị n’
anya!
Elu ụdọ awụlaga anyị
n’ anya!
Ụdọ awụlaga anyị n’
anya!
Ala ụdọ awụlaga anyị
n’ anya!
Ụdọ awụlaga anyị n’
anya!
Iyeeeeeooo!
Iyeeeeeooo!
Obodo gbaa!
Obodo gba n’ maa!
Ndiomu gbaa!
Ndiomu gba n’ maa!
Iyeeeeeooo!
Iyeeeeeooo!
OTU N’ IME HA GA N’
ETI MKPU N’ ASỊ:
Kaaaaaaaaa!
Kokokokokokooooooo!
Hum!
Kaaaaaaaaa!
Kokokokokokooooooo!
Elele ele lele leoooo!
Maa agaru noooooo!
Kaaaaaaaaa!
Kokokokokokooooooo!
Ọnọ n’ ụzọ gbaa! ( ọga
eti ya ihe dịka ugboro atọ, obidizie n’ isi tiwe mkpu ọzọ)
Maa mechaa nkea
ọ ga aga n’ obu osi pụọ ga metọpụ nke fọdụrụ. N’ ime ụbọchị abụọ ndịa ụmụnwanyị
adịghị apụta iro, ọ bụ ụmụnwaoke toruru etoru n’ aga ozi nile aga apụapụ mee. ọ
bụrụ n’ maa alachaa ụmụnwanyị n’ enwe aṅụrị, maka ihe egwu ọ n’ emenye ha.
Ụbọchị Orie ụmụnwanyị n’ ekuru OGURU n’ awụsa n’ ụzọ nile dị n’ obodo ka ewee
wụpụcha ihe nile maa hapụrụ wee laa.
Ihe eji etiri maa bụ n’ ọ n’ anọ dịka onye nche, ebe esemokwu dị maa n’ aga
edozi ya, ọ n’ ata ndị mere arụ ahụhụ n’ Agbamere na ọ n’ e bupu ma lie onye
nwụrụrụ anwụrụ n’ agụ Amike (Ugwu dị n’ Amike). Ọ bụ ịdị mma obodo ka eji mara
ya.
2.4. Ekala (Oke Ala).
Ekala bụ mmeme ọzọ ndị Agbamere n’ eme, ọ bụ n’ oriri Ekala ka
ndị nna n’ eduru ụmụ ha n’ egosi ha oke ala ha nile, ebe nile ala ha dị. Ụbọchị
Ekala n’ ụtụtụ ndị nna n’ ezinụlọ ọbụla n’ eduru ụmụ ya ndị nwọke gagharịa
gosicha ha ala ha nile na oke ya nile, emechaa nke ha alọta rie nri chere n’
mgbede oge ndị nna n’ ụmụnna nile ga eduru ndi nke ha meekwa otu ihe ahụ ndị
nna ezinụlọ ọbụla mere n’ ụtụtụ. Emechaa nkea oriri adazia n’ ezinụlọ ọbụla,
aga eri ya ụbọchị ahụ nile.
ISI NKE ATỌ
3.1. Oriri Ezemkpume.
Oriri Ezemkpume bụ oriri ndị Ọgwashị dị n’ Agbamere n’ eme afọ
nile. Oriria n’ eme ka ndị Ọgwashị nile ọnọnije na ndị nọ n’ ụlọ, n’ alata n’
eme ya. A n’ eme ya ụbọchị Eke na Orie, ụbọchị Eke n’ abụ anya abalị, ha n’ akụ
egwu IGEDE bido n’ mgbede ruo ụbọchị Orie, ka a n’ akụ egwu a n’ aṅụ mmanya n’
eri ji ahụrụ n’ ọkụ na anụ ọkụkọ ahụrụ n’ ọkụ. Chi ụbọchị Orie foo, ha n’ esi
ụtara ji na anụ ewu n’ ọnụ Ezemkpume ndị okenye nile dị n’ Agbamere n’ abịa
suru ji na anụ ewu ahụ, ọbụrụ na ha emechaa nkea, ha n’ edose ọjị n’ elu ỌKWA
EZEMKPUME, ha dose ya, ha agọwa ọnụ n’ arịọ Ezemkpume ka ozitere ha ihe ha ga
eri, wepuru ha ihe ga eri ha. Chi jiwe ụmụnwanyi ndị Ọgwashị eburu ụtara ji ha
siri na bee ha bia ụmụaka na onye ọbụla eriwe, ndị di ha eburu mmanya aga aṅụ
bịa, onye ọbụla n’ aṅụgide mmanya ike gwụ ya. Ọbụrụ n’ ATTAMA EZEMKPUME ewere
oji ya lawa ndị mmadụ nile ahapụ ihe ha rifodoro lawa. Ụbọchị Afọ ụmụnwanyi
abia bupu ihe eriforo wụnye ya n’ onunu Ezemkpume, nkea abia wetezie emume
Ezemkpume na isi mjedebe.
3.2. Oriri Ugwube.
Oriri Ugwube, bụ kwa oriri nke ndị Owere Ugwu n’ eri. Ọ bụ ka esi eri oriri
Ezemkpume ka esi eri ya, kama ihe dị iche bụ n’ ndị Owere Ugwu n’ eri nke ha
ụbọchị Orie na Afọ. Ma chi Nkwọ foo, kama aga awụfu ihe erifodoro, ha n’ eburu
ya n’ aga n’ ụlọ n’ ụlọ n’ eke ndị mmadụ ihe oriri. Ndi mmadụ n’ eji obi ụtọ n’
anabata yam aka n’ ọ bụ onyinye si n’ aka Ugwube. Mana ndigbo sị n’ “Egbe
adighi ada n’ ala gbara aka”, n’ otu aka ahụ kwa ha agaghị enye gị ihe, ị hapụ
ha ka ha lawa, ị ga enye ha ihe onyinye dịka ego ma ọ bụ ihe ị kọtara n’ ugbo,
ị nye ha, ịrịo Ugwube ihe ịchọrọ ka omere gị. Ha kechaa ya ewete mmeme nkea n’
mjedebe.
3.3. Ịgọ Okike.
Ịgọ Okike n’ onwe ya bụ kwa oke mmeme a n’ eme n’ mgwụcha afọ, iji kele Okike
maka ndụ na ihe ndị ọzọ nile onyere ha n’ afọ ahụ, mana arịọ kwa maka afọ nke
n’ abịa abịa. Ihe eji agọ Okike gụnyere, ewu, ọkụkọ ọcha, ụtara ji, mmanya mkwụ
ọcha (mkwu elu) na mkpụrụ ọjị anọ, nke ụbọchị ahịa anọ dị n’ ala igbo. Onye n’
esi n’ esi nke ya n’ ezinụlọ ya ga erichanwu, na mmanya ya na ezinụlọ ya ga
aṅụchanwu. Ọjị ka a n’ ebunye ATTAMA OKIKE, owepụta ndị aga ata, oburu ndị nke
ọzọ laa be ya tawa ya n’ aha Okike. Onwe onye nwụrụ ụbọchị a n’ agọ Okike asị
n’ onye ahụ nwụrụ ezigbo ọnwụ, nihi n’ Okike kuru ya n’ aka wee laa. Onwe kwa
onye amụrụ ụbọchị ahụ a n’ asị kwa n’ amụrụ ya nke ọma nihi n’ ọ bụ nwa Okike.
Asị n’ ndị nile n’ abụ Attama Okike bụ ndị amụrụ n’ ụbọchị a n’ agọ Okike. Egwu
a n’ agụrụ Okike ụbọchị a n’ agọ ya bụ nkea:
Okike lee anyị!
Bụ ụmụ gị!
Okike lee ihe anyị ji
bia!
Anyị bụ ụmụ gị!
Okike lee anyị!
Bụ ụmụ gị!
Okike lee ọjị taa!
Okike lee nri rie!
Okike lee aṅụ taa!
Okike lee mmanya ṅụọ!
Okike lee anyị!
Bụ ụmụ gị!
Okike lee ihe anyị ji
bia!
Anyị bụ ụmụ gị!
Agụchaa egwua, erimeri
ebido, onye rijuo onwere aṅụrị lawa na bee ya. Ekwenyere n’ adighi ewe iwe
ụbọchị a n’ agọ Okike, adịghị ezu ori, adighi ejekwu nwanyi ọbụla na kwa n’
adịghị eme ihe ọbụla rụrụ arụ ụbọchị ahụ. Onye mee ya Okike ga egbu onye ahụ
ozugbo ozugbo. Ọ n’ abụ oke ụbọchị onye ọbụla n’ atụ anya ya. Ụbọchị ahụ kwa
ndị nile zuru ihe mmadụ n’ ewpụta ya do se ya ebe onye nwe ya ga ahụ ya ka
owere ya.
ISI NKE ANỌ
4.1. Ihe ọzọ eji mara
Agbamere.
Ihe ọzọ eji mara Agbamere bụ na ha bụ ndị dị ike ọrụ. Ịbịa n’ Eha-Alụmọna nile,
ihe ha jiri mara ndị Agbamere bụ na ha adịghị eme efu. Ụmụnwoke ejeghi akwụkwọ
n’ azụ ahịa ma ọ bụ arụ ọrụ. Ndị be anyị n’ arụtasi ọrụ ugbo ike. N’ Agbamere,
ọrụ aka nile ịchọrọ ma ọ bụ ọrụ aka nile dị n’ ụwa, ị ga enweta ya ebe ahụ.
Ụmụnwanyị ndị ejeghị akwụkwọ n’ kwa azụ ahịa nke nukwu na arụkwa ọrụ ụmụnwanyị,
dịka ike isi, ịkwa akwa na ihe ndị ọzọ dị iche iche.
E jikwa isi ike mara ndị Agbamere, nihi n’ asị na ha adịghị ekwe n’ ihe onye
ọzọ kwuru n’ adabaghị n’ nke ha kwuru. Ma ha adịghị achọ ime ihe onye ọzọ kwuru
ka eme.
Ha n’ eji ya azọpụta
onwe ha n’ mmekpe ahụ ga esi ebe ọbụla ma ọ bụ n’ aka onye ọbụla bịa. Ọ bụ isi
ike mere ha ji merie ndị Nsụkka n’ ọgụ ha na ha lụrụ, ọ bụkwa ya mere nna ha ji
si ka o biri n’ oke ala ya na Nsụkka na Ọba.
4.2. MMECHI.
Obodo ọbụla nwere ihe eji mara ha dị cha iche iche. A n’ enwe
ezi ihe a n’ eji ama obodo na kwa ajọ ihe eji mara ha. Agbamere bụ otu n’ ime
obodo ahụ eji ihe ọma na ihe ọjọ mara. Agbamere n’ eme ọfụma n’ ihe so igba mbọ
maka ihe eji enyere ndụ aka. Mgbe gboo ịgọ mụọ bụ ihe dị mma na ihe eji eto
ọnụ, e jikwa ya mara Agbamere dịka ihe mara mma ha n’ eme ma n’ emeta ya ọfụma,
ha n’ onye ha ji kwa ya eto ọnụ oge ahụ. Mana ka ọ dị ugbua ha jikwazị ịka ụka
nke ukwuu mara ha. Ihe ọzọ ha n’ eme ọfụma bụ ịkwụ n’ ụzọ eziokwu ụtụtụ oge, n’
abụghị oge nile.
Ma abịa n’ ihe ọjọ eji mara Agbamere bụ n’ ha dịghị ekwe ekwe, ọ
n’ adị mma ịge ntị ọtụtụ oge n’ ihi n’ onweghị onye machara ihe nile. Ma a n’
esikwa n’ aka mmadụ ibe mmadụ amụta ihe ọtụtụ oge. Mmadụ bụ CHUKWU ibe ha,
mmekọrita mmadụ na ibe ya adịka mma. N’ olu Nsụkka a n’ asị “eshị na
eshị bụ mkashị ji eme” ya bụ n’ mekọrịta ede na ibe ya ka oji
amịta nri. ọzọ kwa bụ n’ ndị Agbamere chọọ imesi gị ike na ha n’ agba mbọ hụ na
ha meruru ya n’ isi, ọkacha onye n’ abụghị onye Agbamere. Ọ n’ adị mma ime
ebere n’ ihi n’ eme onye ka emere ibe ya obi adị yam ma. Ebere dị mkpa n’ ndụ
mmadụ maka n’ ihe iji tụnyere mmadụ ka aga eji tụnyere gị. Ebere imere onye ọzọ
ka aga emere gị otu oge na otu ụbọchị.
EBE ỌRỤA SI.
Ø Ajụjụ ọnụ mụ jụrụ Onyeishi
Cyril Eze bụ nna m na onye isi Ụmụezeọna na Ogbodu Ọlrụ.
Ø Ajụjụ ọnụ mụ jụrụ Onyeishi
Moses Asogwa bụ onye isi Ụmụegbe n’ Owere-Ala.
Ø Akwụkwọ ndị A
P U (Agbamere Progressive Union) dere maka Abgamere. N’ afọ 2015.
Ø Akwụkwọ Ụkọ
Amụlụche Nnamanị dere maka Eha-Alụmọna. N’ afọ 2010.
No comments:
Post a Comment